Igbo highlife

Igbo highlife
music genre
obere ụdị nkeEgwu Igbo, highlife Dezie

Igbo haịlaịf bụ egwu ọgbara ọhụrụ nkenụụdị nke kpokọtara haịlaịf na egwu ọdịnaala Igbo ọnụ. Ọ malitere mbụ na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ nke Naịjirịa, n'oge 1950. Nkenụụdị bụkarị egwu Jita, ya na ọbele njirimara ngwakọta nke opi na ụda olu. [1] [2] A na-ekwekarị ukwe Igbo haịlaịf n'asụsụ Igbo mgbe ụfọdụ a na-etinye ya n’asụsụ Bekee a gwara ọgwa. [3] Otu onye n’ime ndị kachasị edee egwu mana emepụta egwu a bụ Chiifụ Stephen Osita Ọsadebe onye ọrụ ya ruru afọ iri anọ ma gafee. Ihe nkiri Osadebe gụnyere ọtụtụ egwu ama ama gụnyere egwu "1984 "Ọsọndị Owendị" nke bugoro ya na ọkwa ụwa dịka onye mbụ bidoro Igbo haịlaịf . [4]

Ọ kwe ukwe na ọ kpọọ jita Oliver De Coque, bụ "onye a gụnyere dịka otu n'ime ndị eji ama atụ na onye isi nkenkepụ n'egwu ọgbara ọhụrụ ama ama." Coque bụ onye kpatara owuwu Igbo haịlaịf na nkanka. [5] N'ime egwu ya ama ama bụ "Biri Ka Mbiri", "Ana Enwe Obodo Enwe", "Nnukwu Mmanwu" na "Identity", ha niile rụpụtara ọfụma na 1980 niile. [6] Ndị ọzọ na-eme ihe nkiri n'oge gara aga n'ụdị a bụ ndị nyere nnukwu onyinye na mmepe ya bụ, Ali Chukwuma, Bright Chimezie, Sir Warrior, [7] Celestine Ukwu, [8] Nico Mbarga, Oriental Brothers, Isaac Rogana Ottah, Ikem Mazeli. [1]

  1. 1.0 1.1 Ikem Mazeli. africaResource (27 September 2008). Archived from the original on 6 October 2014. Retrieved on 30 September 2014.
  2. Video Abaraka Guitar Band of Nigeria (Nigeria) – Egwu Ndidi (80′s Evergreen Igbo Highlife!). Peganabenga.com.br (14 March 2014). Archived from the original on 28 June 2015. Retrieved on 30 September 2014.
  3. Igbo Highlife. Global Groove (16 February 2012). Archived from the original on 6 October 2014. Retrieved on 30 September 2014.
  4. Nigeria's Chief Stephen Osita Osadebe dead. United Press International (19 May 2007). Retrieved on 30 September 2014.
  5. Patterson. Expressions of Africa in Los Angeles Public Performance, 1781—1994. 
  6. Harris, Craig. King (Dr.) Chief Oliver de Coque. Retrieved on 30 September 2014.
  7. Dr. Sir Warrior + Oriental Brothers Band Vintage Hits Vol 1 (Nigeria) @ [256k]. Archived from the original on 6 October 2014. Retrieved on 30 September 2014.
  8. Discography of Celestine Ukwu (Celestine Obiakor). Archived from the original on 6 August 2014. Retrieved on 1 October 2014.

© MMXXIII Rich X Search. We shall prevail. All rights reserved. Rich X Search